Abù Ọma 63 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma Devid, mb͕e ọ nọ n'ọzara Juda.

1. Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike:Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike,N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.

2. Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi,Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi.

3. N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu;Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi.

4. Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu:N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu.

5. Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ;Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;

6. Ọ buru na echetam I n'elu utem,Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi.

7. N'ihi na I buworom iye-aka,Ọ bu kwa n'okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'nēti nkpu ọṅù.

8. Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu:Mu ka aka-nri-gi jideworo.

9. Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n'iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim,Ha gābà n'ebe nile di ala nke uwa.

10. Agarara ha nye n'aka mma-agha:Òkè nke nkita-ọhia ka ha gābu.