Abù Ọma 110 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma Devid.

1. Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.

2. Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa:Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi.

3. Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi;N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu;Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.

4. Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya,Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di.

5. Onye-nwe-ayi n'aka-nri-giAmapúwo ndi-eze n'ubọchi iwe-Ya.

6. Ọ gēkpe ikpe n'etiti mba nile,Ebe nile juputara n'ozu;Ọ mapúwo isi madu n'elu ọtutu ala.