Abù Ọma 105 Bible Nso (IGBOB)

1. Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.

2. Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.

3. Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

4. Nāchọnu Jehova na ike-Ya;Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

5. Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

6. Unu nkpuru Abraham, bú orù-Ya,Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

7. Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

8. O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi,Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;

9. Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

10. O we me ka o guzoro Jebok ibu ukpuru,Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

11. Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean,Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

12. Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole,E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

13. Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ,Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

14. Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;

15. Si, Unu emetula ndim etere manu aka,Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam.

16. O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu;Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.

17. O zìri otù nwoke iga n'iru ha;Erere Josef ka ọ buru orù:

18. Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike;Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè:

19. Rue mb͕e okwu-Ya rère;Okwu-ọnu Jehova nuchara ya.

20. Eze ziri ozi, we tọpu ya;Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ.

21. O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya,Na onye nāchi ihe nile o nwetara:

22. Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ,Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe.

23. Israel we bata nime Ijipt;Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham.

24. O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku;O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.

25. Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì,Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.

26. O zigara Moses, bú orù-Ya,Na Eron onye Ọ rọputara.

27. Ha doro n'etiti ha ihe iriba-ama-Ya nile,Do kwa ihe-ebube di iche iche n'ala Ham.

28. O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie;Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.

29. Ọ b͕anwere miri-ha ka ha ghọ ọbara,We me ka azù-ha nwua.

30. Ala-ha nuputara awọ,N'ime-ulo nile nke ndi-eze-ha.

31. O kwuru okwu, odudu we bia,Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.

32. O mere oké miri-ozuzo-ha ka ha ghọ ákú-miri-ígwé,Na ọku nēnwu enwu n'ala-ha.

33. O we tie osisi vine nile ha na osisi fig nile ha ihe;Tiji kwa osisi nke ókè-ala-ha.

34. O kwuru okwu, igurube we da,Ha na umu-igurube nādighi ọnu-ọgugu,

35. Ha we richapu ihe-ọkukú ọ bula di n'ala-ha,Richapu kwa nkpuru nke ala-ubi-ha.

36. O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha,Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.

37. O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo:Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.

38. Ijipt ṅuriri mb͕e ha putara;N'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ha.

39. Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi;Na ọku inye ìhè n'abali.

40. Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia,O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.

41. O meghere oké nkume, miri we rùputa;Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.

42. N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya,Na Abraham, bú orù-Ya.

43. O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta,Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.

44. O we nye ha ala nile nke mba Kenean nile;Ọ bu kwa ihe ndi ọzọ di iche iche dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inwe ka ha nwetara: