Abù Ọma 54 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Maschil Devid: mb͕e ndi Zif biara, si Sọl, Devid, ọ̄ dighi-ezo onwe-ya n'etiti ayi?

1. Chineke, were aha-Gi zọputam,Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.

2. Chineke, nuru ekperem;Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum.

3. N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem,Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim:Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah

4. Le, Chineke bu onye nēyerem aka:Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim.

5. Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha:Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.

6. M'gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà:M'gēkele aha-Gi, Jehova, n'ihi na ọ di nma.