Abù Ọma 81 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Gittith. Abù Ọma nke Esaf.

1. Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ:Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike.

2. Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti,Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.

3. Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu,N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.

4. N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu,Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.

5. Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya,Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt:Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu.

6. Ewezugaram ubu-ya n'ibu:Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga.

7. Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi;Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe;Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah

8. Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi:Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!

9. Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi;I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.

10. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi,Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa:Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya.

11. Ma ndim egeghi nti olum;Israel ekweghikwam.

12. M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha,Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.

13. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti,Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile!

14. Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala,Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam.

15. Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya:Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi.