Abù Ọma 128 Bible Nso (IGBOB)

Abú Nrigo.

1. Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu,Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile.

2. N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri:Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma.

3. Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi:Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi.

4. Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahuNke nātu egwu Jehova.

5. Jehova gēsi na Zaion gọzie gi:Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi,