Abù Ọma 44 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora. Maschil.

1. Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi,Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.

2. Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya;I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.

3. N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu,Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha:Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi,N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.

4. Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke:Nye nzọputa nile nke Jekob iwu.

5. Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi:Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.

6. N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi,Mma-agham adighi-azọputakwam.

7. Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi,I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì.

8. Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile,Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah

9. Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere;I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha.

10. I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu:Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha.

11. I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri;N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.

12. I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia,I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha.

13. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò.

14. I nēme ayi ilu n'etiti mba nile,Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche.

15. Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum,Ihere irum ekpuchiwokwam,

16. N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu;N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.

17. Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi,Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi

18. Obi-ayi alaghachighi azu,Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;

19. Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia,Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.

20. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;

21. Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.

22. N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile;Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.

23. Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi?Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.

24. N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi?N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi?

25. N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá:Afọ-ayi araparawo n'ala.