Abù Ọma 17 Bible Nso (IGBOB)

Ekpere Devid.

1. Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum;Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe.

2. Ka ikpém si n'iru Gi puta;Anya-Gi nāhu izi-ezi.

3. I nwawo obim; I letawom n'abali;I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe;Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè.

4. Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-GiKa mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya.

5. Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile,Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha.

6. Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke:Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum.

7. Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime GiSite n'iru ndi nēbili imegide ha.

8. Debem dika nwa-anya-Gi,Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi,

9. Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe,Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu.

10. Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba:Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.

11. Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi:Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala.

12. Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike,Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo.

13. Bilie, Jehova,Buru ya uzọ, me ka o ruru ala:Me ka nkpuru-obim b͕apu n'aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi;

14. N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova,N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a,Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba:Afọ nēju ha n'umu,Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.