Abù Ọma 34 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke Devid; mb͕e ọ b͕anwere omume-ya n'iru Abimelek, o we chupu ya, o we la.

1. M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile:Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.

2. Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi:Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.

3. Sonum me ka Jehova di uku,Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù.

4. Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram,We naputam n'ujọm nile.

5. Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.

6. Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.

7. Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,Ọ we dọputa ha.

8. Detunu ire, hu na Jehova di nma:Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.

9. Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.

10. Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.

11. Bianu, umum, gem nti:Egwu Jehova ka m'gēzi unu.

12. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?

13. Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.

14. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.

15. Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.

16. Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ,Ibipu ncheta-ha n'uwa.

17. Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru,We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.

18. Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa,Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.

19. Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume:Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.

20. Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile:Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.

21. Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua:Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.