Abù Ọma 46 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora; n'elu Alamoth. Abù.

1. Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike,O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.

2. N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe,Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri;

3. Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu,Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya. Selah

4. Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu,Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu.

5. Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya:Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.

6. Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha:O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.

7. Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi;Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah

8. Jenu, hu ọlu nile nke Jehova,Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa,

9. Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa;Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube;Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.

10. Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke:Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.