Abù Ọma 104 Bible Nso (IGBOB)

1. Gọzie Jehova, nkpuru-obim.Jehova, Chinekem I di uku nke-uku;Ebube na ima-nma ka I yiriworo dika uwe.

2. Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi;Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:

3. Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri:Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya;Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe:

4. Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe;Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

5. Ọ tọwo ntọ-ala uwa n'elu ọnọdu-ya guzosiri ike,Ka aghara iwezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6. I were ob͕u-miri kpuchie ya dika uwe;N'elu ugwu nile ka miri nēguzo.

7. Site n'ibasi-nba-ike-Gi ha nāb͕alaga;Site n'olu éb͕è-elu-igwe-Gi ha nāzọli ọsọsọ;

8. (Ugwu nile nārigo, ndagwurugwu nile nārida;)Rue ebe ahu nke I tọrọri ntọ-ala-ya nye ha.

9. I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya;Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.

10. Gi Onye nēzipu isi-iyi di iche iche ka ha ba na ndagwurugwu;N'etiti ugwu ka ha nērù:

11. Ha nēnye anu ọhia ọ bula miri iṅu;Inyinya-ibu-ọhia nēmeju akpiri-ikpọ-nku-ha.

12. N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi,Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.

13. I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri:Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.

14. I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-uloNēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu;Ime ka nri si n'ala puta:

15. Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria,Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu,Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.

16. Afọ nēju osisi nile nke Jehova;Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo;

17. Ebe umu-nnunu na-akù akwú:Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.

18. Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia;Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà.

19. O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà:Anyanwu mara ọdida-ya.

20. I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali;Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.

21. Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u,N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.

22. Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha,We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche.

23. Madu nāpu ga ọlu-yaGa kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.

24. Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!N'amam-ihe ka I meworo ha nile:Uwa juputara n'ihe I nwetara.

25. Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.

26. N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.

27. Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

28. I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.

29. I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.

30. I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha;I we me ka iru ala di ọhu.

31. Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi;Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile:

32. Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji;Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.

33. M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile:M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.

34. Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ:Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.