Abù Ọma 120 Bible Nso (IGBOB)

Abù Nrigo.

1. Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim,O we zam.

2. Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha,Na n'ire aghughọ.

3. Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi,Gi ire aghughọ?

4. Àkú di nkọ nke dike,Ha na icheku-ọku nke osisi broom.

5. Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek,Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!

6. Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworoN'akuku onye nākpọ udo asì.