Abù Ọma 21 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1. Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu;Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!

2. Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya,I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah

3. N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya:I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.

4. Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu,Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi.

5. Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi:Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.

6. N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi:I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.

7. N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi,Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya.

8. Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile:Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì.

9. I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi:Jehova gēloda ha n'iwe-Ya,Ọku gēripia kwa ha.

10. I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì,Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu.

11. N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi:Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.

12. N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu,I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.