Abù Ọma 13 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1. Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi?Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?

2. Rùe ole mb͕e ka m'gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim,Nēru újú n'obim n'ehihie nile?Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim?

3. Legide anya, zam, Jehova, Chinekem:Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu;

4. Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike;Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum.

5. Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi;Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi: