Abù Ọma 56 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Jonath elem rehokim. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ndi Filistia jidere ya na Gat.

1. Merem amara, Chineke; n'ihi na madu ekusiwo ume ike ilom:Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um.

2. Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile:N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu.

3. N'ubọchi m'nātu egwu,Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.

4. Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

5. Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile:N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ.

6. Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha,Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya,Dika ha leworo anya nkpuru-obim.

7. Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu?N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke.

8. Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu:Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi;Hà adighi n'akwukwọ-Gi:

9. Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi:Nka ka m'mara, na Chineke dirim.

10. Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya.

11. Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

12. N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di:M'gākwughachi Gi ekele nile.