Abù Ọma 52 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Maschil Devid: mb͕e Doeg, bú onye Edom, biara gosi Sọl, si ya, Devid bara n'ulo Ahimelek.

1. Gini mere i nēto onwe-gi n'ihe ọjọ, gi dike?Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile.

2. Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè;Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.

3. I huwo ihe ọjọ n'anya kari ezi ihe;Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume. Selah

4. I huwo okwu nile nēloda eloda n'anya,Gi ire aghughọ.

5. Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi,Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi,Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah

6. Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu,Chì kwa ya ọchi, si,

7. Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike;Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya,Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.

8. Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke:Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi.