Abù Ọma 121 Bible Nso (IGBOB)

Abú Nrigo.

1. M'gēweli anyam abua le ugwu nile:Òle ebe iye-akam gēsi bia?

2. Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia,Onye meworo elu-igwe na uwa.

3. Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya:Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.

4. Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura,Bú Onye nēdebe Israel.

5. Jehova bu Onye nēdebe gi:Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi.

6. Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie,Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali.

7. Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi;Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.