Ọlu Ndi-Ozi 9:25-37 Bible Nso (IGBOB)

25. ma ndi nēso uzọ-ya kuru ya n'abali, weda ya n'ala site na mb͕idi nke obodo, nārada ya n'abọ.

26. Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n'aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus.

27. Ma Banabas jidere ya n'aka, we duru ya jekuru ndi-ozi, kọrọ ha otú ọ hururi Onye-nwe-ayi n'uzọ, kọkwa-ra ha, si, na Ọ gwara ya-ri okwu, ya na otú o kwuwarari okwu na Damaskọs n'aha Jisus.

28. Ya na ha we nọ, ọ nābata nāpu kwa na Jerusalem,

29. nēkwuwa okwu n'aha Onye-nwe-ayi: o we nāgwa ndi-Ju nāsu asusu Grik okwu, ya na ha nājurita kwa onwe-ha ajuju; ma ha tiyere aka-ha ib͕u ya.

30. Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs.

31. Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.

32. O rue, mb͕e Pita nējezu n'ebe nile, ọ ridakuru kwa ndi nsọ ndi bi na Lida.

33. O we hu n'ebe ahu otù nwoke, aha-ya bu Ineas, onye tọb͕ọrọ arọ asatọ n'ute-ya; n'ihi na akuku-aru-ya nwuru anwu.

34. Pita we si ya, Ineas, Jisus Kraist nēme gi ka aru di gi ike: bilie, dozi kwa ute nke gi. Ngwa ngwa o we bilie.

35. Ndi nile bi na Lida na Sheron we hu ya, ndi ahu we chigharikute Onye-nwe-ayi.

36. Ma otù nwanyi nke nēso uzọ Jisus nọ na Jọpa, aha-ya bu Tabita, nke anākpọ Dọkas, ma asugharia ya: nwanyi a juputara n'ezi ọlu na ọlu ebere nke ọ nēme.

37. Ma o ruru n'ubọchi ahu, na aru-ya adighi ike, o we nwua: mb͕e ha sasiri ya aru, ha tọbọ ya n'ime-ulo di n'elu ulo.

Ọlu Ndi-Ozi 9