Ọlu Ndi-Ozi 7:40-53 Bible Nso (IGBOB)

40. nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, onye duputara ayi n'ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya.

41. Ha we kpua nwa-ehi n'ubọchi ahu, we butere arusi ahu ihe àjà, we ṅuria n'ọlu aka-ha.

42. Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si,Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaramỌ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel?

43. Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk,Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan,Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha:M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon.

44. Nna-ayi-hà nwere ulo-ikwū nke àmà n'ọhia, dika Ọ kara àkà, bú Onye gwara Moses, ka o me ya ka ọ di ka ihe-atù nke ọ hururi.

45. Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid;

46. onye huru amara n'iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi.

47. Ma Solomon wuru Ya ulo.

48. Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n'ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri,

49. Elu-igwe bu oche-ezem,Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua:Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru:Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem?

50. Ọ̀ bughi akam mere ihe ndia nile?

51. Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme.

52. Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:

53. unu ndi natara iwu ahu dika enyere ya site n'aka ndi-mọ-ozi, ma unu edebeghi ya.

Ọlu Ndi-Ozi 7