Ọlu Ndi-Ozi 16:10-22 Bible Nso (IGBOB)

10. Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n'obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma.

11. Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n'echi-ya ayi we rue Neapọlis;

12. ayi we site n'ebe ahu ga rue Filipai, nke bu otù obodo nke Masedọnia, obodo mbu nke akuku ahu, buru kwa colony nke Rom: ayi we nānọgide n'obodo ahu ubọchi ufọdu.

13. N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu.

14. Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n'ihe nile Pọl nēkwu.

15. Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi.

16. O we rue, mb͕e ayi nāga ebe ekpere, na otù nwa-ab͕ọghọ onye nwere mọ nke anākpọ Paiton zutere ayi, onye nēwetara ndi-nwe-ya ọtutu urù site n'ibu amuma ugha.

17. Nwanyi a nēso ayi na Pọl, nēti nkpu, si, Madu ndia bu ndi-orù Chineke Onye kachasi ihe nile elu, ndi nēkwusara unu uzọ nzọputa.

18. Ma nka ka ọ nēme ọtutu ubọchi. Ma Pọl, ebe ike gwuru ya nọ̄, o chighariri, si mọ ahu, Anamenye gi iwu n'aha Jisus Kraist ka i si nime ya puta. O we puta n'otù oge hour ahu.

19. Ma mb͕e ndi-nwe-ya huru na olile-anya nke urù-ha alawo, ha jidere Pọl na Sailas, we dọkpuru ha ba n'ọma-ahia n'iru ndi-isi,

20. mb͕e ha kutasiri ha n'iru ndi-ikpé, ha si, Ndikom ndia, ebe ha bu ndi-Ju, ha nēme ka obi lọ ndi obodo-ayi miri nke-uku,

21. ha nēkwusa kwa ọme-n'ala nke nēzighi ezi n'iwu ka ayi nara, ma-ọbu ime, ebe ayi bu ndi Rom.

22. Ìgwè ndi ahu we guzo ọtọ n'otù imegide ha: ndi-ikpé we dọwapu uwe-ha, nye kwa iwu ka apia ha utari.

Ọlu Ndi-Ozi 16