Ndi-Ikpe 19:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. O we bilie n'isi-ututu n'ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n'obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe.

9. Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.

10. Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.

11. Mb͕e ndi ahu nọ nso Jebus, ubọchi jemiri nke-uku; nwa-okorọbia ahu we si onye-nwe-ya, Biko, bia, ka ayi wezuga onwe-ayi jerue obodo a nke ndi Jebus, nọ ọnọdu-abali nime ya.

12. Onye-nwe-ya we si ya, Ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi jerue obodo onye ala ọzọ, ebe onye sitere n'umu Israel nānọghi; kama ayi gāgabiga rue Gibea.

13. O we si nwa-okorọbia-ya, Bia, ka ayi biarue nso otù nime ebe ndia; ayi gānọ kwa ọnọdu-abali na Gibea, ma-ọbu na Rema.

14. Ha we gabiga, nēje ije-ha; anyanwu we dakpugide ha n'akuku Gibea, nke diri Benjamin.

15. Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, ibà inọ ọnọdu-abali na Gibea: ọ ba, nọdu n'amá obodo ahu: ma ọ dighi nwoke nāchikọta ha ba n'ulo-ya inọ ọnọdu-abali.

16. Ma, le, otù agadi nwoke siri n'ọlu-ya, bú n'ubi, bia n'anyasi; ma nwoke ahu sitere n'ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin.

17. O welie anya-ya abua, hu onye-ije ahu n'amá obodo; agadi nwoke ahu we si, Òle ebe i nēje? òle ebe i si bia kwa?

18. Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya.

Ndi-Ikpe 19