Ọpupu 23:22-26 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na, ma ọ buru na i ge nti n'olu-ya n'ezie, we me ihe nile nke M'nēkwu, M'gābu-kwa-ra ndi-iro-gi onye-iro, kpab͕u kwa ndi nākpab͕u gi.

23. N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa.

24. Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.

25. Ma unu gēfè Jehova, bú Chineke-unu, Ọ gāgọzi kwa nri-gi na miri-gi; M'gēwe-zuga kwa ọria n'etiti gi.

26. Ọ gaghi-adi nwayi nēmebi ime ma-ọbu nwayi-àgà n'ala-gi: M'gēmezu ọnu-ọgugu ubọchi-gi.

Ọpupu 23