11. Iyi nke Jehova gādi n'etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe ibe-ya jetara n'ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa.
12. Ma o buru na ezuru ya n'ori n'aka-ya n'ezie, ọ gākwughachi onye-nwe-ya.
13. Ọ buru na anu ọhia dọb͕uru ya n'ezie, ya webata ya ka ọ buru ihe-àmà; ọ gaghi-akwughachi ihe anu-ọhia dọb͕uru.
14. Mb͕e onye ọ bula gāriọta anumanu n'aka ibe-ya, ihe we meru ya aru, ma-ọbu ọ nwua, mb͕e onye-nwe-ya nānọghi yere ya, ọ ghaghi ikwughachi.
15. Ọ buru na onye-nwe-ya nọyere ya, ọ gaghi-akwughachi: ọ buru na ọ bu ihe egoro ọlu, ọ biara n'ihi ugwọ-ọlu-ya.
16. Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya.
17. Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.
18. Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.
19. Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua.
20. Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.
21. Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.
22. Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.
23. Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya;
24. iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.
25. Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.
26. Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n'ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya:
27. n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu.
28. Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.