Ọpupu 20:10-26 Bible Nso (IGBOB)

10. ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:

11. n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.

12. Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

13. Gi eb͕ula madu.

14. Gi akwala iko.

15. Gi ezula ori.

16. Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.

17. Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.

18. Ndi Israel nile we nāhu éb͕è-elu-igwe nile, na ire-ọku nile, na olu opì-ike ahu, na ugwu ahu ka ọ nākwu anwurù: mb͕e ndi ahu huru ya ha we ṅaghari, guzo n'ebe di anya.

19. Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu.

20. Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu: n'ihi na ọ bu inwa unu ka Chineke biaworo, ya na ka egwù-Ya we di n'iru unu, ka unu we ghara imehie.

21. Ndi Israel we guzo n'ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ.

22. Jehova we si Moses, Otú a ka i gāsi umu Israel, Unu onwe-unu ahuwo na esiwom n'elu-igwe kpayere unu uka.

23. Unu emela chi ọzọ tiyerem; chi ọla-ọcha ma-ọbu chi ọla-edo, unu emerela onwe-unu ha.

24. Ebe-ichu-àjà nke ájá ka i gēmerem, chu kwa àjà-nsure-ọku-gi nile na àjà-udo-gi nile n'elu ya, bú ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi: n'ebe nile ọ bula ebe M'nēme ka echeta aham, n'ebe ahu ka M'gābiakute gi, gọzi kwa gi.

25. Ma ọ buru na ebe-ichu-àjà nke nkume ka i gēmerem, ewerela nkume awara awa wu ya: n'ihi na asi na i mewo ka ihe-ọlu-gi ga n'elu ya, i we me ka ọ ghara idi nsọ.

26. Ewerela ihe-nrigo rigo n'ebe-ichu-àjàm, ka ewe ghara ikpughe ọtọ-gi n'elu ya.

Ọpupu 20