Ọnu-Ọgugu 25:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.

14. Ma aha nwoke Israel ahu nke etib͕uru etib͕u, onye etib͕uru ya na nwayi Midian, bu Zimri, nwa Salu, bú onye-isi nke otú ulo nna nke ndi Simeon.

15. Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.

16. Jehova we gwa Moses okwu, si,

17. Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha:

18. n'ihi na ha nākpab͕u unu n'aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n'okwu Peoa, na n'okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n'ubọchi ihe-otiti ahu n'okwu Peoa.

Ọnu-Ọgugu 25