3. O we si ya, Si n'ala-gi na n'etiti ikwu-gi pua, bia n'ala ahu nke M'gēgosi gi.
4. Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a:
5. ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.
6. Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n'ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ.
7. Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a.
8. O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.
9. Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya,
10. weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum.
11. Oké unwu we dikwasi Ijipt na Kenean dum, ya na oké nkpab͕u: nna-ayi-hà ahughi ihe gēju ha afọ.
12. Ma mb͕e Jekob nuru na ọka di n'Ijipt, o we zipu nna-ayi-hà na mbu.
13. Na nke mere ya ub͕ò abua ewe me ka umu-nne Josef mara Josef; ewe me ka ndi-aru Josef puta ìhè nye Fero.
14. Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise.
15. Jekob we ridata n'Ijipt; o we nwua, ya onwe-ya, na nna-ayi-hà;
16. ewe būru ha gabiga n'ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n'ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n'ọla-ọcha go n'aka umu Hemoa nime Shekem.