Ọlu Ndi-Ozi 5:28-39 Bible Nso (IGBOB)

28. si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi.

29. Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.

30. Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n'ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n'elu osisi.

31. Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.

32. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya.

33. Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha.

34. Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n'èzí nwa oge.

35. O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime.

36. N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.

37. Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n'ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n'etiti ndi-Ju so ya n'azu: onye ahu la-kwa-ra n'iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya.

38. M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala:

39. ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.

Ọlu Ndi-Ozi 5