Ọlu Ndi-Ozi 5:22-36 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma ndi nēje ozi ndi biara ahughi ha n'ulo-nkpọrọ; ha we laghachi, kọrọ ha,

23. si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n'ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya.

24. Ma mb͕e ọchi-agha nke ulo Chineke na ndi-isi-nchu-àjà nuru okwu ndia, ha nwere obi abua nke-uku bayere ha ebe nka gērusi.

25. Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n'ulo-nkpọrọ nọ n'ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe.

26. Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.

27. Ma mb͕e ha kutasiri ha, ha guzoro ha n'etiti nnọkọ-ikpé.

28. si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi.

29. Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu.

30. Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n'ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n'elu osisi.

31. Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.

32. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya.

33. Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha.

34. Ma otù onye biliri na nnọkọ-ikpé ahu, bú onye-Farisi, aha-ya bu Gameliel, onye nēzí iwu Moses, onye ndi-Ju nile nāsọpuru, o we kwue ka akpọpu madu ahu n'èzí nwa oge.

35. O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime.

36. N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.

Ọlu Ndi-Ozi 5