Ndi-Ikpe 8:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. O si n'ebe ahu rigorue Penuel, gwa ha okwu dika nka: ndikom Penuel we za ya dika ndikom Sukot zara ya.

9. O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m'latara n'udo, m'gākwatu ulo-elu a.

10. Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

11. Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha.

12. Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji.

13. Gideon nwa Joash we si n'agha ahu site na nrigo Heres lata.

14. Ọ nwude otù nwa-okorọbia sitere na ndikom Sukot, o we jua ya ajuju: o we dere ya aha ndi-isi Sukot na ndi-okenye-ya n'akwukwọ, ọgu ndikom atọ na iri na asa.

15. O we biakute ndikom Sukot, si, Le Zeba na Zalmuna, ndi unu taram uta bayere ha, si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye ndikom-i ndi nāda #mbà nri.

16. O were ndi-okenye obodo ahu, na ogwu ọzara na ùgà, o were ha me ka ndikom Sukot mara ihe.

17. Ọ kwatu ulo-elu Penuel, b͕ue ndikom obodo ahu.

18. Ọ si Zeba na Zalmuna, Ndikom ahu nke unu b͕uru nime Teboa, hà di aṅa? Ha si, Dika i di, otú a ka ha di; onye ọ bula di ka umu eze n'aru.

Ndi-Ikpe 8