Ma Zeba na Zalmuna b͕alagara; o we chua ha; o we nwude ndi-eze abua nke Midian, bú Zeba na Zalmuna, me ka ọmuma-ulo-ikwū ahu nile ma jijiji.