Ndi-Ikpe 3:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. nání ka ọb͕ọ nile nke umu Israel we mara, izí ha agha, nání ndi nāmaghi ha na mb͕e gara aga;

3. bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.

4. Ha di kwa ka ewere ha nwa Israel, imara ma ha gānu ihe nile Jehova nyere n'iwu, nke O nyere ndi bu nna-ha n'iwu n'aka Moses.

5. Umu Israel we biri n'etiti ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

6. ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè.

7. Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot.

8. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ.

9. Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere umu Israel, ọ we zọputa ha, bú Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb.

10. Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.

11. Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.

12. Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n'ihi na ha emewo ihe ọjọ n'anya Jehova.

13. O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu.

14. Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.

15. Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n'aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma.

Ndi-Ikpe 3