Ndi-Ikpe 12:3-15 Bible Nso (IGBOB)

3. M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha?

4. Jefta we chikọta ndikom nile nke Gilead, buso Efraim agha: ndikom Gilead we tib͕ue Efraim, n'ihi na ha siri, Ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim ka unu, bú ndi Gilead, bu, n'etiti Efraim, na n'etiti Manase.

5. Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;

6. ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n'ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n'Efraim.

7. Jefta we kpe Israel ikpe arọ isi. Jefta, bú onye Gilead, we nwua, elìe ya n'obodo Gilead.

8. Mb͕e ọ nwusiri, Ibzan, onye sitere na Bet-lehem, we kpe Israel ikpe.

9. O nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ọ muru, ọ bu kwa orú umu-ya ndinyom na iri ka o zipuru n'èzí, orú ndinyom na iri ka o me-kwa-ra ka ha si n'èzí batara umu-ya ndikom. O we kpe Israel ikpe arọ asa.

10. Ibzan we nwua, elìe ya na Bet-lehem.

11. Mb͕e ọ nwusiri, Ilon, bú onye Zebulun, we kpe Israel ikpe; o we kpe Israel arọ iri.

12. Ilon, bú onye Zebulun, we nwua, elìe ya n'Ajalon n'ala Zebulun.

13. Mb͕e ọ nwusiri, Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we kpe Israel ikpe.

14. O nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom abua na orú umu umu na iri, ndi ọgu umu-inyinya-ibu atọ na iri nēbu: o we kpe Israel ikpe arọ asatọ.

15. Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we nwua, elìe ya na Piraton n'ala Efraim, n'ugwu ndi Amalek.

Ndi-Ikpe 12