1. Ndikom Efraim we kpọkọta onwe-ha, gabiga akuku Ugwu; ha we si Jefta, Gini mere i gabigara ibuso umu Amon agha, ma ayi ka i nākpọghi isoro gi je? ayi gēsure ulo-gi n'isi gi n'ọku.
2. Jefta we si ha, Onye nēse okwu nke-uku ka m'buworo, mu onwem na ndim na umu Amon; m'we tikue unu, ma unu azọputaghm n'aka-ha.
3. M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha?
4. Jefta we chikọta ndikom nile nke Gilead, buso Efraim agha: ndikom Gilead we tib͕ue Efraim, n'ihi na ha siri, Ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim ka unu, bú ndi Gilead, bu, n'etiti Efraim, na n'etiti Manase.
5. Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;
6. ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n'ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n'Efraim.
7. Jefta we kpe Israel ikpe arọ isi. Jefta, bú onye Gilead, we nwua, elìe ya n'obodo Gilead.