20. Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri.
21. Abnea we si Devid, Ka m'bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n'udo.
22. Ma, le, ndi-orù Devid na Joab si n'usu ndi nāpunara madu ihe bia, ọ bu kwa ọtutu ihe-nkwata ka ha bubatara n'aka ha: ma Abnea anọyeghi Devid nime Hebron; n'ihi na o zilagawo ya, o we la n'udo.
23. Joab na usu-ndi-agha nile ndi soro ya we bia, ha we gosi Joab, si, Abnea nwa Nea biakutere eze, o we zilaga ya, o we la n'udo.
24. Joab we biakute eze, si, Gini ka i meworo? le, Abnea biakutere gi; n'ìhi gini ka nka bu, na i zilagawo ya, o we lasia?
25. I mawo Abnea nwa Nea, na ọ bu irafu gi ka ọ biara, ya na imara ọpupu-gi na nbata-gi, na imata ihe nile nke gi onwe-gi nēme.
26. Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi.
27. Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.