9. Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n'ulo ahu, ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova.
10. Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.
11. O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke akwukwọ iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.
12. Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,
13. Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi.
14. Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.
15. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,
16. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo:
17. n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe muye ọnumam dika ọku megide ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.
18. Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,
19. n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Jehova, mb͕e i nuru ihe M'kwuru megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, na ha gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-nkọcha, i we dọwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
20. N'ihi ya, le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a. Ha we weghachiri eze okwu.