1. Ndi Kọrint 7:26-35 Bible Nso (IGBOB)

26. Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.

27. Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.

28. Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.

29. Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n'ub͕u a;

30. ka ndi nākwa ákwá we di ka ha akwaghi; ka ndi nāṅuri ọṅu we di ka ha aṅurighi; ka ndi nāzu ahia we di ka ha enweghi ihe;

31. ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n'ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga.

32. Ma anamachọ ka unu buru ndi nādighi-echeb͕u onwe-unu. Onye nēnweghi nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, otú ọ gēme ihe gātọ Onye-nwe-ayi utọ:

33. ma onye nwere nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe uwa, otú ọ gēme ihe gātọ nwunye-ya utọ.

34. Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.

35. Ma nka ka m'nēkwu ka ọ bara unu onwe-unu urù; ọ bughi ka m'fekwasi ihe-ntuhi n'aru-unu, kama ka eme ihe kwesiri, ya na ka unu we nọdu n'iru Onye-nwe-ayi ghara inwe uche-nb͕asasi.

1. Ndi Kọrint 7