Ọpupu 39:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. Ọ mekwara ephod ahu, ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

3. Ha we tisa mbadamba ihe ọla-edo ahu, we bìri ya ka ọ buru eriri, ikpa n'etiti ogho anunu ahu, na n'etiti ogho ododo ahu, na n'etiti ezi ákwà ọcha ahu, ọ bu ọlu onye-ọ̀kà.

4. Ha we mere ya ubu abua ejikọtara: na nsọtu-ya abua ka ejikọtara ya.

5. Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu.

6. Ha mekwara nkume onyx ahu, nke emere ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu, nke eb͕uru ha eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di.

7. O tiye ha n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu.

8. Ọ mekwara ihe-ib͕ochi-obi ahu, ọ bu ọlu nke onye-ọ̀kà, dika ọlu aluru n'ephod ahu; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.

9. Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka o bu; ha mere ihe-ib͕ochi-obi ahu ka ọ buru ihe apiajiri apiaji: ntù-aka ka ogologo-ya di, ntù-aka ka obosara-ya di kwa, mb͕e apiajiri ya.

10. Ha hiọgide-kwa-ra nime ya ariri nkume anọ: ariri sardius na topaz na carbuncle bu ariri mbu.

11. Ariri nke-abua bu emerald na sapphire na diamond.

12. Ariri nke-atọ bu jacinth na agate na amethyst.

13. Ariri nke-anọ bu beryl na onyx na jasper: etiyere ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha.

14. Nkume ahu di ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha diri ebo iri na abua ahu.

15. Ha mekwara n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.

Ọpupu 39