15. Ha mekwara n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.
16. Ha me-kwa-ra ihe ọla-edo abua akpara akpà, na nb͕a-aka ọla-edo abua: ha we tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.
17. Ha tiye-kwa-ra iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.
18. Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, ha tiye-kwa-ra ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu, n'ebe iru-ya di.
19. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.
20. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.
21. Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
22. Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu;
23. ọnu uwe-nwuda ahu di n'etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya.
24. Ha mekwara n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma.
25. Ha mekwara ataṅu ọla-edo anāgwaghi agwa, tiye ataṅ ahu n'etiti pomegranate ahu n'elu ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, n'etiti pomegranate ahu;
26. otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu.
27. Ha we mere Eron, mekwara umu-ya ndikom, uwe-ime ahu, ha bu ezi ákwà ọcha, ọlu nke ọkpa-ákwà,
28. na ákwà-nkukù-isi ahu, ọ bu ezi ákwà ọcha, na ihe ahu mara nma ike n'isi, ha bu ezi ákwà ọcha, na uwe-ukwu ahu nke ezi ákwà ọcha, ha bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma,