15. Ha mekwara n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.
16. Ha me-kwa-ra ihe ọla-edo abua akpara akpà, na nb͕a-aka ọla-edo abua: ha we tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.
17. Ha tiye-kwa-ra iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.
18. Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, ha tiye-kwa-ra ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu, n'ebe iru-ya di.
19. Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.