18. Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu.
19. Ide-ha di anọ, ukwu-ha di kwa anọ, ha bu ọla; nkpọye nile ha bu ọla-ọcha, ihe-nmachita nke isi-ha na ngegide nile ha bu kwa ọla-ọcha.
20. Ma ǹtú nile ebe-obibi ahu nwere, na nke ogige ahu buruburu nwere, bu ọla.
21. Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.
22. Ma Bezalel nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda, mere ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu.
23. Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.
24. Ọla-edo nile nke ejiri je ozi ahu n'ije-ozi nile nke ebe nsọ ahu, bú ọla-edo nke àjà-ofufé ahu, di orú talent na iteghete, na nnù shekel na ọgu iri na ọgu isi na iri, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di.
25. Ọla-ọcha nke ndi agukọtara agukọta n'etiti nzukọ Israel di ọgu talent ise, na nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: