7. na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.
8. Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha.
9. Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.
10. Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.
11. I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka i gāmachita ya, i gēme kwa mpempe ọla-edo n'elu-ya buruburu.
12. I gāwu-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye ha n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ.
13. I gēme kwa nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.
14. I gēme kwa ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu.
15. Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n'aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya.
16. I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi.
17. I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi.
18. I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie.
19. Gi me otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n'elu nsọtu-ya abua.
20. Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi.