1. Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya:
2. ma nání Moses onwe-ya gābiakute Jehova nso; ma ha onwe-ha agaghi-abiaru nso; ndim agaghi-eso kwa ya rigota.
3. Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n'otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha.
4. Moses we de okwu Jehova nile n'akwukwọ, o bilie n'isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n'okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di.
5. O zie umu-okorọbia nke umu Israel, ha we sure àjà-nsure-ọku, chiri kwa oke-ehi chuara Jehova àjà, bú àjà-udo.
6. Moses we were nkera ọbara-ha, tiye n'ọkwa di iche iche; nkera ọbara-ha ka ọ wusara n'ebe-ichu-àjà.
7. Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa.
8. Moses we were ọbara ahu, wusa ya n'aru ndi Israel, si, Le, ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, nke Jehova b͕aworo n'ebe unu nọ bayere okwu ndia nile.