31. Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya.
32. Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu.
33. Mb͕e onye ọ bula gēmeghe olùlù, ma-ọbu mb͕e onye ọ bula gēgwu olùlù, ghara imechi ya, ehi ma-ọbu inyinya-ibu ewe dabà nime ya,
34. onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.