9. Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.
10. Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.
11. Jehova we gwa Moses okwu, si
12. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya,
13. ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ewe zopu ihe ahu n'anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu;
14. mọ ekworo ewe garue nwoke ahu aru, o we kwo nwunye-ya ekworo, nwayi ahu ewe rua áru: ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgarue ya arú, o we kwo nwunye-ya ekworo, ma nwayi ahu arughi árú:
15. nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.
16. Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n'iru Jehova: