Ọnu-Ọgugu 5:5-12 Bible Nso (IGBOB)

5. Jehova we gwa Moses okwu, si,

6. Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ha gēme ihe nime nmehie nile nke madu, imekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ikpe ewe ma nkpuru-obi ahu;

7. ha gēkwuputa kwa nmehie-ha nke ha meworo: ọ gēnyeghachi kwa ihe ikpe mara ya nime ya n'isi-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ya ka ọ gātukwasi ya, nye onye ahu ikpe mara ya bayere ya.

8. Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya.

9. Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.

10. Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.

11. Jehova we gwa Moses okwu, si

12. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya,

Ọnu-Ọgugu 5