Ọnu-Ọgugu 22:34-41 Bible Nso (IGBOB)

34. Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n'ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n'uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-gi, m'gālaghachi n'onwem.

35. Mọ-ozi nke Jehova we si Belam, Soro ndikom ahu je: ma nání okwu ahu nke m'gāgwa gi, nke ahu ka i gēkwu. Belam we soro ndi-isi Belak je.

36. Belak we nu na Belam abiawo, o we pua izute ya rue obodo Moab, nke di n'ókè-ala Anon, nke di na nsọtu ókè-ala ahu.

37. Belak we si Belam, Èziteghm ozi ike ike n'ebe i nọ ikpọ gi? n'ìhi gini ka i nābiakuteghm? ọ̀ bu ezi-okwu na apughm isọpuru gi?

38. Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu.

39. Belam we soro Belak je, ha we biarue Kiriat-huzot.

40. Belak we chua ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu n'àjà, we zigara Belam, ziga-kwa-ra ndi-isi ndi ha na ya nọ.

41. O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.

Ọnu-Ọgugu 22