Ọnu-Ọgugu 14:3-11 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n'ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n'agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n'Ijipt?

4. Ha we sirita onwe-ha, Ka ayi me otù onye onye-isi, ka ayi laghachi kwa n'Ijipt.

5. Moses na Eron we da kpue iru-ha n'ala n'iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel.

6. Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha:

7. ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku.

8. Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

9. Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha.

10. Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.

11. Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha?

Ọnu-Ọgugu 14