10. Moses we nu ndi Israel ka ha nākwa ákwá n'ab͕uru nile ha, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya: iwe nke Jehova we di ọku nke-uku; ọ jọ-kwa-ra njọ n'anya Moses.
11. Moses we si Jehova, N'ìhi gini ka I ji mejọ orù-Gi? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka m'nāhutaghi kwa amara n'iru Gi, na I nēbom ibu nke ndi nka nile?
12. Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?
13. Òle ebe m'gēsi nwe anu inye ndi nka nile? n'ihi na ha nākwasom ákwá, si, Nye ayi anu, ka ayi we rie.