Ọlu Ndi-Ozi 9:40-43 Bible Nso (IGBOB)

40. Ma Pita chupuru ha nile n'èzí, we b͕ue ikperè n'ala, kpe ekpere; o we chigharia n'ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie.

41. O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n'iru ha.

42. Ewe mara ya na Jọpa dum: ọtutu madu we kwere n'Onye-nwe-ayi.

43. O we rue, na ọ nọgidere ọtutu ubọchi na Jọpa n'ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu.

Ọlu Ndi-Ozi 9