12. ọ hu-kwa-ra otù nwoke, aha-ya bu Ananaias, ka ọ nābata, nēbikwasi kwa ya aka-ya abua n'isi, ka ewe me ka ọ hu uzọ.
13. Ma Ananaias zara, si, Onye-nwe-ayi, anurum n'ọnu ọtutu madu ihe bayere nwoke a, ka ha ra, bú ajọ ihe o mere ndi nsọ Gi na Jerusalem:
14. n'ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u.
15. Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:
16. n'ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n'ihi aham.
17. Ananaias we je, ba n'ulo ahu; o we bikwasi ya aka-ya abua n'isi, si, Sọl, nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka i hu Ya n'uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ.
18. Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n'anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism;
19. o we nara nri, ewe me ka ọ nwe ume.Ya na ndi nēso uzọ Jisus na Damaskọs we nọ ubọchi ufọdu.
20. Ngwa ngwa n'ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke.
21. Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n'aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n'ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u je n'iru ndi-isi-nchu-àjà.
22. Ma emere Sọl ka o nwe kari ike, ọ nēkwu kwa okwu nke b͕ara ndi-Ju bi na Damaskọs ghari, ebe ọ nēgosi nke-ọma na Onye a bu Kraist-ha.
23. Ma mb͕e ọtutu ubọchi zuru, ndi-Ju b͕ara ìzù ib͕u ya: